Lamentations 1

1Lee ka obodo ahụ nke ndị ya dị ọtụtụ
si bụrụ ebe tọgbọrọ nʼefu!
Lee ka o si ghọọ nwanyị di ya nwụrụ,
bụ obodo ahụ a maara aha ya nʼetiti mba niile.
Lee ka onye naara abụ eze nwanyị nʼetiti ala niile a na-achị achị
si ghọọ ohu.

2Ọ na-akwasị akwa ike nʼabalị,
anya mmiri na-asọdakwa na nti ya,
nʼetiti ndị ahụ niile hụrụ ya nʼanya,
ọ dịghị onye na-akasị ya obi.
Ndị enyi ya niile aghọgbuola ya;
ha niile aghọọla ndị iro ya.

3Juda ejeela biri nʼala ọzọ,
mgbe o siri nʼọnọdụ mweda nʼala na ndọgbu nʼọrụ pụta.
Ọ na-ebi nʼetiti mba dị iche iche,
ma ọ chọtaghị ebe izuike ọbụla.
Nʼetiti nhụju anya ya
ndị niile na-achụ ya ọsọ achụkwutela ya.

4Okporoụzọ niile e si eje Zayọn na-eru ụjụ,
nʼihi na ọ dịghị onye na-abịakwa na mmemme ndị ahụ a kara aka.
Ọnụ ụzọ ama ya niile atọgbọrọla nʼefu,
ndị nchụaja ya na-asụ ude,
ụmụ agbọghọ nọ nʼọnọdụ mwute,
ya onwe ya nọkwa nʼọnọdụ dị ilu.

5Ndị iro ya aghọọla ndị na-achị ya;
ndị iro ya nọ nʼahụ udo.
Nʼihi na Onyenwe anyị emekpaala ya ahụ,
nʼihi ịba ụba nke njehie ya niile.
E burula ụmụntakịrị ya bulaa mba ọzọ,
dịka ndị a dọtara nʼagha.

6Ịma mma niile
esitela nʼahụ ada Zayọn pụọ.
Ụmụ eze ya dị ka ele
nke na-enweghị ike ịchọta ebe ịta nri.
Nʼihi adịghị ike ha,
ha esitela nʼihu ndị na-achụ ha ọsọ gbalaga.

7Nʼụbọchị ndị ahụ niile e wedara ya nʼala,
Jerusalem echetala akụ ndị ahụ niile bụ nke ya na mgbe ochie.
Jerusalem echetala ha nʼụbọchị ndị ahụ niile ọ na-awagharị.
Mgbe ndị ya dabara nʼaka ndị iro ya,
o nweghị onye inyeaka ha hụrụ.
Nʼoge ahụ, ndị iro ya hụrụ ọnọdụ
ya, chịa ya ọchị.

8Jerusalem emehiela nke ukwu,
nʼezie, ọ ghọọla ihe rụrụ arụ.
Ndị ahụ niile na-asọpụrụ ya na mbụ elelịala ya anya,
nʼihi na ha ahụla ọtọ ya.
Ya onwe ya kwa na-asụ ude,
ma chigharịakwa azụ.

9Ịrụ arụ ya pụtara ihe, ọ bụladị nʼuwe ya.
Ọ dịkwaghị mgbe o chere echiche banyere ihe dị na-eche ya nʼoge dị nʼihu.
Lee ka o si daa, dasie ike,
ma ọ dịghị onye bịara kasịe ya obi.
Onyenwe anyị, lee nsogbu m niile.
Lee ka ndị iro si merie m.”

10Onye iro agbasaala aka ya
chịkọtaa akụ ya niile.
O ji anya ya hụ ka mba ndị ọzọ dị iche iche
si bata ebe nsọ ya.
Ndị ahụ na-ekwesighị ịbata
bụ ndị batara nʼebe nzukọ gị.

11Ndị ya niile na-asụ ude
mgbe ha na-achọ ihe ha ga-eri.
Ha na-ewere ihe ha nwere nye nʼihi oriri,
ime ka ha nwee ike dịrị ndụ.
Onyenwe anyị, lee, ma tuleekwa ihe ndị a niile,
nʼihi na abụrụla m onye a na-elelị.”

12“Ọ bụ na ọ dịghị emetụ unu nʼobi, unu ndị niile na-esi ebe a na-agafe?
Legharịanụ anya unu ka unu hụrụ.
O nwere ahụhụ dịka ahụhụ m,
nke e mere ka ọ bịakwasị m,
bụ nke Onyenwe anyị mere ka ọ bịakwasị m,
nʼụbọchị ọ na-ewe iwe ya dị ọkụ?

13“O si nʼelu zite ọkụ,
e, o zitere ọkụ nke na-ere nʼime ọkpụkpụ m.
Ọ gbasara ụgbụ nʼebe ụkwụ m ga-esi gafee,
meekwa ka m laghachi azụ.
O mere ka m bụrụ ihe tọgbọrọ nʼefu,
onye na-ada mba ogologo ụbọchị niile.

14“Ọ na-eleru anya na mmehie m niile;
Maọbụ, ọ kpaala mmehie m niile dịka agbụ yoku

jiri aka ya na-akpa ha dịka ụdọ.
A nyakwasịla ya nʼolu m.
Onyenwe anyị emeela ka ike gwụsịa m.
O werela m nyefee nʼaka ndị ahụ
m na-apụghị iguzogide.

15“Onyenwe anyị ajụla
ndị niile bụ dike nʼagha nọ nʼetiti m.
Ọ kpọkuola usuu ndị agha ka ha bịa buo agha megide m,
ka ha bịa gwepịa ụmụ okorobịa m niile.
Nʼebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị ya
ka Onyenwe anyị zọchara ada Juda na-amaghị nwoke.

16“Ọ bụ nke a mere m ji akwa akwa.
Ọ bụ ya mekwara anya mmiri ji ju m anya.
O nweghị onye nkasiobi ọbụla nọ m nso;
o nwekwaghị onye ga-akpọghachi mkpụrụobi m.
Ụmụ m atọgbọla nʼefu,
nʼihi na onye iro emeriela.”

17Lee ka Zayọn si gbasapụ aka ya
ma o nweghị onye nkasiobi o nwere.
Onyenwe anyị enyela iwu banyere Jekọb
na ndị agbataobi ya ga-aghọ ndị iro ya.
Jerusalem aghọkwaala
ihe rụrụ arụ nʼetiti ha.

18“Ma Onyenwe anyị bụ onye ezi omume.
Ọ bụ mụ onwe m nupuru isi nʼiwu ya.
Geenụ ntị unu ndị niile,
leenụ anya nʼụdị ahụhụ dakwasịrị m.
A dọtala ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa m niile nʼagha
buru ha jee mba ọzọ.

19“Akpọkuru m ndị mụ na ha dị na mma,
ma ha ghọgburu m.
Ndị nchụaja m na ndị okenye m
nwụrụ nʼime obodo
mgbe ha nọ na-achọta nri
ha ga-eji debe onwe ha ndụ.

20“Lee, Onyenwe anyị, ka m si bụrụ onye ahụhụ dị ukwuu dakwasịrị.
Ime anụ ahụ m na-anụ ọkụ,
obi m kwa enweghị izuike nʼime m
nʼihi na onye nnupu isi dị ukwuu ka m bụ.
Nʼezi, ọ bụ mma agha ka a ga-eji mee ka mmadụ gbara aka nwa.
Ma nʼime ụlọ, ọ bụ naanị ọnwụ dị ya.

21“Ndị mmadụ anụla olu ịsụ ude m,
ma o nweghị onye bịara ịkasị m obi.
Ndị iro m niile anụla akụkọ ihe ọjọọ dakwasịrị m,
ma ha na-aṅụrịkwa ọṅụ nʼihi ihe i mere ka ọ bịakwasị m.
Mee ka ụbọchị ahụ i kara aka bịa,
nke ga-eme ka ha dịrị ka m dị.

22“Kwere ka ihe ọjọọ niile ha na-eme bịa nʼihu gị.
Mesokwa ha mmeso
dịka i si mesoo m
nʼihi mmehie niile nke m.
Nʼihi na ịsụ ude m dị ọtụtụ,
ana m adakwa mba nʼobi m.”
Copyright information for IboBIU